12Onye ọbụla nwere Ọkpara ahụ nwere ndụ ma onye ọbụla na-enweghị Ọkpara Chineke enweghị ndụ.
13Ana m edere unu ihe ndị a unu ndị kweere nʼaha Ọkpara Chineke, ime ka unu mata na unu nwere ndụ ebighị ebi.
14Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.
15Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.
16Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.