1 Jọn 5

Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.

1 John 5:16 (UKJV) If any man see his brother sin a sin which is not unto death, he shall ask, and he shall give him life for them that sin not unto death. There is a sin unto death: I do not say that he shall pray for it.

14Nkwuwa okwu anyị nwere na ya bụ, na ọ bụrụ na anyị arịọ ihe ọbụla dịka ọchịchọ obi ya siri dị, ọ na-anụ olu anyị.

15Ọ bụrụkwanụ na anyị matara na ọ na-anụ olu anyị mgbe ọbụla anyị rịọrọ ya ihe, anyị na-amatakwa na anyị anatala ihe ọbụla anyị rịọrọ ya.

16Ọ bụrụ na onye ọbụla ahụ ka nwanna ya na-eme mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ, ya kpee ekpere, Chineke ga-enyekwa onye ahụ ndụ. Nke a bụ maka ndị ahụ mmehie ha na-abụghị nke na-eduba nʼọnwụ. E nwere mmehie na-eduba nʼọnwụ. Asịghị m unu kpee ekpere maka nke ahụ.

17Ajọ omume niile bụ mmehie, ma ọ dị mmehie nke na-adịghị eduba nʼọnwụ.

18Anyị matara na onye ọbụla amụrụ site na Chineke anaghị aga nʼihu na-eme mmehie, kama onye ahụ nke amụrụ site na Chineke na-echekwa ha, ajọ onye ahụ adịghị emetụkwa ha aka.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.