19Anyị maara na anyị bụ ụmụ Chineke, ụwa niile nọkwa nʼokpuru ike ajọ onye ahụ.
20Anyị matakwara na Ọkpara Chineke abịala, nyekwa anyị nghọta ka anyị mara ya, onye bụ eziokwu. Anyị nọ nʼime onye ahụ bụ eziokwu, ọ bụladị nʼime Ọkpara ya, bụ Jisọs Kraịst. Ya onwe ya bụ ezi Chineke bụrụkwa ndụ ebighị ebi.
21Ụmụ m, wezuganụ onwe unu site nʼarụsị niile.