1 Ndị Eze 1

Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ị ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn.

1 Kings 1:12 (UKJV) Now therefore come, let me, I pray you, give you counsel, that you may save yours own life, and the life of your son Solomon.

10ma ọ kpọghị Netan onye amụma, maọbụ Benaya, maọbụ ndị agha niile na-eche Devid nche. Ọ kpọkwaghị Solomọn nwanne ya.

11Mgbe ahụ, Netan onye amụma jụrụ Batsheba nne Solomọn ajụjụ sị, “Ị nụghị na Adonaịja nwa Hagit aghọọla eze ugbu a, ma onyenwe anyị bụ Devid amaghị ihe ọbụla banyere ya?

12Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ị ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn.

13Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’

14Mgbe ị ka nọ na-akpanyere eze ụka, mụ onwe m ga-abịakwute gị gbaa okwu niile ị na-ekwu ume.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.