12Ma ugbu a, ka m dụọ gị ọdụ otu ị ga-esi zọpụta ndụ gị na ndụ nwa gị Solomọn.
13Bakwuru eze Devid sị ya, ‘Onyenwe m bụ eze, ọ bụ na i kweghị m bụ ohu gị nkwa sị: “Nʼezie, Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ ga-anọdụ nʼocheeze m”? Ma gịnị mere Adonaịja ji bụrụ eze?’
14Mgbe ị ka nọ na-akpanyere eze ụka, mụ onwe m ga-abịakwute gị gbaa okwu niile ị na-ekwu ume.”
15Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya.
16Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze. Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?”