15Batsheba bakwuuru eze nʼime ụlọ. Eze emeela nnọọ agadi nke ukwuu. Abishag onye Shunem nọkwa na-elekọta ya.
16Batsheba gburu ikpere nʼala, kpọọ isiala nye eze. Mgbe ahụ, eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị na-achọ?”
17Batsheba zara sị ya, “Onyenwe m, i jiri Onyenwe anyị Chineke gị ṅụọrọ m iyi, kwee m nkwa sị na nwa m Solomọn ga-abụ eze, nọdụkwa nʼocheeze gị.
18Ma ugbu a, Adonaịja aghọọla eze, ma gị onyenwe m bụ eze amaghị ihe banyere nke a.
19O jirila ọtụtụ igwe ehi na ụmụ ehi gbara abụba, na atụrụ chụọ aja. Ọ kpọkwara ụmụ ndị ikom eze niile na Abịata onye nchụaja, na Joab onyeisi agha. Ma ọ kpọghị Solomọn bụ ohu gị.