1Mgbe eze Devid ghọrọ agadi, nʼagbanyeghị na-eji ọtụtụ uwe kpuchie ya, ahụ ya ekpoghị ọkụ.
2Ya mere, ndị na-ejere ya ozi sịrị ya, “Ka anyị chọtara eze otu nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, onye ga-akwụ nʼihu eze ma bụrụkwa onye ga-elekọta ya. O nwere ike idina nʼakụkụ onyenwe anyị bụ eze ime ka ahụ kpoo ya ọkụ.”
3Ha gagharịrị nʼala Izrel niile chọọ nwaagbọghọ mara mma, chọta otu nwaagbọghọ onye Shunem, aha ya bụ Abishag, kpọtaara ya eze.
4Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu; ọ lekọtakwara eze, jekwaara ya ozi ma ya na eze enweghị mmekọ ọbụla.