24Netan sịrị, “Onyenwe m, bụ eze, ọ bụ gị onwe gị sịrị Adonaịja ga-abụ eze mgbe ị nwụrụ, na ọ ga-anọkwasịkwa nʼocheeze gị?
25Taa, ọ gaala jiri ọtụtụ igwe ehi, na ụmụ ehi gbara abụba, na ụmụ atụrụ chụọ aja. Ọ kpọọkwala ụmụ ndị ikom eze niile. Ọ kpọkwara ndịisi agha, na Abịata onye nchụaja. Ha na ya na-eri ihe oriri, na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-eti mkpu na-asị, ‘Eze Adonaịja ga-adị ruo mgbe ebighị ebi.’
26Ma ha akpọghị mụ bụ ohu gị na Zadọk, onye nchụaja, na Benaya nwa Jehoiada, na ohu gị bụ Solomọn.
27Ọ bụ site nʼaka onyenwe m bụ eze ka ihe nke a siri mee, ma i meghị ka ndị ohu ya mata onye ga-anọdụ nʼocheeze onyenwe m eze, mgbe ọ nọghịkwa ya?”
28Mgbe ahụ, Devid kwuru okwu sị, “Kpọọrọnụ m Batsheba.” Batsheba batara, guzo nʼihu eze.