1 Ndị Eze 1

Mgbe ahụ, Devid kwuru okwu sị, “Kpọọrọnụ m Batsheba.” Batsheba batara, guzo nʼihu eze.

1 Kings 1:28 (UKJV) Then king David answered and said, Call me Bathsheba. And she came into the king's presence, and stood before the king.

26Ma ha akpọghị mụ bụ ohu gị na Zadọk, onye nchụaja, na Benaya nwa Jehoiada, na ohu gị bụ Solomọn.

27Ọ bụ site nʼaka onyenwe m bụ eze ka ihe nke a siri mee, ma i meghị ka ndị ohu ya mata onye ga-anọdụ nʼocheeze onyenwe m eze, mgbe ọ nọghịkwa ya?”

28Mgbe ahụ, Devid kwuru okwu sị, “Kpọọrọnụ m Batsheba.” Batsheba batara, guzo nʼihu eze.

29Mgbe ahụ, eze ṅụrụ iyi sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, Onye ahụ napụtara m site na nsogbu m niile,

30otu ahụ m siri ṅụrụ gị iyi nʼaha Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sị, na Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ bụ ya ga-anọchi anya m, nọdụkwa nʼocheeze m. Otu ahụ ka m ga-eme nʼụbọchị taa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.