1 Ndị Eze 1

Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”

1 Kings 1:31 (UKJV) Then Bathsheba bowed with her face to the earth, and did reverence to the king, and said, Let my lord king David live for ever.

29Mgbe ahụ, eze ṅụrụ iyi sị ya, “Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ, Onye ahụ napụtara m site na nsogbu m niile,

30otu ahụ m siri ṅụrụ gị iyi nʼaha Onyenwe anyị, Chineke Izrel, sị, na Solomọn nwa gị ga-abụ eze nʼọnọdụ m, ọ bụ ya ga-anọchi anya m, nọdụkwa nʼocheeze m. Otu ahụ ka m ga-eme nʼụbọchị taa.”

31Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”

32Mgbe ahụ, Devid nyere iwu sị, “Kpọọrọ m Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada.” Mgbe ha niile bịara nʼihu eze,

33ọ sịrị ha, “Duru ndị ozi onyenwe unu, tinyere unu onwe unu, mee ka Solomọn nwa m nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke mụ onwe m, kpọrọnụ ya gbada Gaihọn.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.