1 Ndị Eze 1

ọ sịrị ha, “Duru ndị ozi onyenwe unu, tinyere unu onwe unu, mee ka Solomọn nwa m nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke mụ onwe m, kpọrọnụ ya gbada Gaihọn.

1 Kings 1:33 (UKJV) The king also said unto them, Take with you the servants of your lord, and cause Solomon my son to ride upon mine own mule, and bring him down to Gihon:

31Mgbe ahụ, Batsheba kpọrọ isiala, gbukwaa ikpere nʼihu eze sị ya, “Ka onyenwe m eze Devid dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”

32Mgbe ahụ, Devid nyere iwu sị, “Kpọọrọ m Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada.” Mgbe ha niile bịara nʼihu eze,

33ọ sịrị ha, “Duru ndị ozi onyenwe unu, tinyere unu onwe unu, mee ka Solomọn nwa m nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke mụ onwe m, kpọrọnụ ya gbada Gaihọn.

34Nʼebe ahụ, ka Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, tee ya mmanụ ịbụ eze Izrel. Fụkwaanụ opi, tiekwanụ mkpu sị, ‘Eze Solomọn ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’

35Mgbe ahụ, unu na ya ga-esokwa gbagota, ọ ga-abịa nọkwasị nʼocheeze m ịchị nʼọnọdụ m. Nʼihi na ọ bụ ya ka m họpụtara ịchị eze nʼIzrel na Juda.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.