1 Ndị Eze 1

Mgbe ahụ, unu na ya ga-esokwa gbagota, ọ ga-abịa nọkwasị nʼocheeze m ịchị nʼọnọdụ m. Nʼihi na ọ bụ ya ka m họpụtara ịchị eze nʼIzrel na Juda.”

1 Kings 1:35 (UKJV) Then all of you shall come up after him, that he may come and sit upon my throne; for he shall be king in my position: and I have appointed him to be ruler over Israel and over Judah.

33ọ sịrị ha, “Duru ndị ozi onyenwe unu, tinyere unu onwe unu, mee ka Solomọn nwa m nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke mụ onwe m, kpọrọnụ ya gbada Gaihọn.

34Nʼebe ahụ, ka Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, tee ya mmanụ ịbụ eze Izrel. Fụkwaanụ opi, tiekwanụ mkpu sị, ‘Eze Solomọn ga-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.’

35Mgbe ahụ, unu na ya ga-esokwa gbagota, ọ ga-abịa nọkwasị nʼocheeze m ịchị nʼọnọdụ m. Nʼihi na ọ bụ ya ka m họpụtara ịchị eze nʼIzrel na Juda.”

36Benaya nwa Jehoiada zara eze sị, “Amen, ka Onyenwe anyị Chineke onyenwe m na eze, kwupụta ya ka ọ dị otu a.

37Dịka Onyenwe anyị si nọnyere onyenwe m bụ eze, biko, ka o si otu a nọnyere Solomọn ime ka ocheeze ya dị ukwuu karịa ocheeze onyenwe m bụ eze Devid.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.