40Ndị Izrel niile sooro ya rigoo, na-afụ ọja na-aṅụrịkwa oke ọnụ, ruo nʼala mara jijiji nʼihi oke ụzụ.
41Adonaịja na ndị ọbịa ya niile nụrụ mkpu ọṅụ ahụ mgbe ha onwe ha na-erisi nri. Mgbe Joab nụrụ opi ike ka ọ na-ada, ọ jụrụ sị, “Gịnị mere oke ụzụ dị otu a ji na-ada nʼime obodo.”
42Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.”
43Jonatan zara ya sị, “Mba, ọ dịghị otu ahụ! Onyenwe anyị eze Devid emeela Solomọn eze.
44Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze.