1 Ndị Eze 1

Ndị Izrel niile sooro ya rigoo, na-afụ ọja na-aṅụrịkwa oke ọnụ, ruo nʼala mara jijiji nʼihi oke ụzụ.

1 Kings 1:40 (UKJV) And all the people came up after him, and the people piped with pipes, and rejoiced with great joy, so that the earth rent with the sound of them.

38Ya mere, Zadọk, onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya, nwa Jehoiada, na ndị Keret na ndị Pelet, duuru Solomọn mee ya ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul nke eze Devid. Emesịa, ha duuru ya gaa Gaihọn.

39Nʼebe ahụ, Zadọk onye nchụaja wepụtara mpi mmanụ ahụ dị nʼụlọ nzute Chineke, were tee Solomọn nʼisi. Ha fụkwara opi. Mgbe ahụ, ndị mmadụ niile tiri mkpu sị, “Ka eze Solomọn dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”

40Ndị Izrel niile sooro ya rigoo, na-afụ ọja na-aṅụrịkwa oke ọnụ, ruo nʼala mara jijiji nʼihi oke ụzụ.

41Adonaịja na ndị ọbịa ya niile nụrụ mkpu ọṅụ ahụ mgbe ha onwe ha na-erisi nri. Mgbe Joab nụrụ opi ike ka ọ na-ada, ọ jụrụ sị, “Gịnị mere oke ụzụ dị otu a ji na-ada nʼime obodo.”

42Ma mgbe ọ ka kpụ okwu ahụ nʼọnụ, lee Jonatan nwa Abịata onye nchụaja, ka ọ batara. Adonaịja sịrị, “Bata! Nʼihi na ị bụ ezi mmadụ amaara m na ọ bụ oziọma ka i ji bịa.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.