43Jonatan zara ya sị, “Mba, ọ dịghị otu ahụ! Onyenwe anyị eze Devid emeela Solomọn eze.
44Eze e zigala ya na Zadọk onye nchụaja, na Netan onye amụma, na Benaya nwa Jehoiada, ndị Keret na ndị Pelet sokwa duru ya gaa. Ha mere ka ọ nọkwasị nʼelu ịnyịnya muul eze.
45Zadọk onye nchụaja na Netan onye amụma eteela ya mmanụ na Gaihọn ịbụ eze. Ha esitekwala nʼebe ahụ ṅụrụ ọṅụ na-alaghachikwa, ndị obodo niile nọkwa ugbu a na-eme mkpọtụ, na-aṅụrịkwa ọṅụ. Ọ bụkwa ụzụ ọṅụ ha ka unu nụrụ.
46Solomọn na-anọkwasị nʼocheeze ugbu a.
47Ọzọkwa, ndị na-ejere eze ozi abịala ikele onyenwe anyị eze Devid ekele, na-asị, ‘ka Chineke gị mee ka aha Solomọn bụrụ aha a ma ama karịa nke gị, ka ocheeze Solomọn dịkwa ukwuu karịa nke gị.’ Eze nọkwa nʼelu ihe ndina ya kpọọ isiala ofufe,