3Ha gagharịrị nʼala Izrel niile chọọ nwaagbọghọ mara mma, chọta otu nwaagbọghọ onye Shunem, aha ya bụ Abishag, kpọtaara ya eze.
4Nwaagbọghọ a mara mma nke ukwuu; ọ lekọtakwara eze, jekwaara ya ozi ma ya na eze enweghị mmekọ ọbụla.
5Nʼoge a, Adonaịja onye nne ya bụ Hagit, wepụtara onwe ya, kwuo sị, “Aga m abụ eze.” Nʼihi nke a, ọ kwadooro onwe ya ụgbọ agha na ọtụtụ ịnyịnya, kpọtakwa iri ndị ikom ise, ndị ga-agba ọsọ nʼihu ya.
6Na ndụ Adonaịja niile, o nweghị oge nna ya baara ya mba site nʼịjụ ya, “Gịnị mere i ji akpa agwa dị otu a?” Ọ bụ nwokorobịa mara mma nke ukwuu; ọ bụ ya na-esotekwa nwanne ya Absalọm.
7Adonaịja na Joab, nwa Zeruaya tinyere Abịata onye nchụaja, kparịtara ụka. Ha kwenyere inyere ya aka ka ọ ghọọ eze.