21Ihe niile Solomọn nwere nke e ji aṅụ ihe bụ ọlaedo ka e ji mee ha. Ngwongwo niile nke dị nʼime ụlọeze nʼOke Ọhịa Lebanọn bụkwa ọlaedo a nụchara anụcha ka e ji kpụọ ha. Ọ dịghị ihe e ji ọlaọcha kpụọ, nʼihi na-agụnyeghị ọlaọcha dịka ihe ọbụla nʼoge Solomọn.
22Eze nwere ọtụtụ ụgbọ mmiri e ji azụ ahịa nʼoke osimiri, tinyere ụgbọ nke Hiram. Otu ugbo nʼafọ atọ, ka ụgbọ mmiri ndị a na-alọta, buru ọlaedo, ọlaọcha na ọdụ enyi, enwe na adaka dị iche iche bata.
23Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nwekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
24Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
25Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.