23Eze Solomọn bara ụba nʼakụ, nwekwa amamihe karịa ndị eze niile dị nʼụwa.
24Ụwa niile na-abịa ịchọ ihu Solomọn ka ha nụta okwu amamihe nke Chineke tinyere nʼobi ya.
25Onye ọbụla bịakwutere ya na-ebutere ya onyinye ịnata ihuọma, ya bụ ngwa ọlaọcha na ọlaedo, uwe dị iche iche, ngwa agha, ụda dị iche iche, ịnyịnya na ịnyịnya muul, nke a bụ kwa afọ, kwa afọ.
26Solomọn chịkọbara ọtụtụ ụgbọ agha na ịnyịnya dị iche iche. O nwere ụgbọ agha dị otu puku na narị anọ na ịnyịnya agha dị puku iri na abụọ nʼọnụọgụgụ, ndị o debere ụfọdụ nʼime ha nʼobodo ụgbọ agha ya ma ndị ọzọ dị na Jerusalem ebe ya onwe ya nọ.
27Eze mere ka ọlaọcha baa ụba dịka nkume efu na Jerusalem. O mekwara ka osisi sida dị ọtụtụ dịka osisi sikamọ nke dị nʼala ala ugwu dị iche iche.