24Devid lara ndị agha Zoba nʼiyi, Rezon chịkọtara ndị ikom gbara ya gburugburu, ghọọ onyendu ha, ndị nnupu isi a gara Damaskọs biri nʼebe ahụ, na-achịkwa nʼebe ahụ.
25Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.
26Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ.
27Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya.
28Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.