25Ogologo ụbọchị niile nke ndụ Solomọn, Rezon bụ onye iro Izrel, tinyekwara nsogbu nke Hadad wetaara Izrel. Rezon bụ eze ndị Aram, bụrụkwa onye na-emegide Izrel.
26Jeroboam nwa Nebat, onye Ifrem nke Zereda, otu nʼime ndị ozi Solomọn, biliri megide eze. Nne ya bụ Zerua, nwanyị di ya nwụrụ anwụ.
27Nke a bụ akụkọ banyere otu o siri bilie imegide eze: Solomọn wugharịrị Milo, wuziekwa ntipu dị na mgbidi obodo Devid bụ nna ya.
28Ugbu a Jeroboam, nʼonwe ya, bụ dimkpa. Mgbe Solomọn hụrụ otu nwokorobịa a si arụzi ọrụ ya nke ọma, o mere ya onye nlekọta ndị ọrụ niile si nʼezinaụlọ Josef.
29Ma otu ụbọchị, mgbe Jeroboam si Jerusalem na-apụ, o zutere Ahija onye amụma, onye Shilo, nʼụzọ, ebe o yi uwe ọhụrụ. Ọ bụkwa naanị ha abụọ nọ nʼọhịa mgbe ahụ.