31Mgbe ahụ, ọ gwara Jeroboam sị, “Chịrị iberibe iri nye onwe gị, nʼihi na otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel sịrị, ‘Lee, aga m anapụ Solomọn alaeze a, ma aga m enyekwa gị ebo iri nʼime ha.
32Ma aga m ahapụrụ ya otu ebo, nʼihi ohu m Devid na nʼihi Jerusalem obodo m họpụtara site nʼebo niile nke Izrel.
33Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere.
34“ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile.
35Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri.