33Nʼihi na ha ahapụla m malite ịkpọ isiala nye Ashtọret, chi nwanyị ndị Saịdọn; na nyekwa Kemosh, chi ndị Moab; na nye Molek, chi ụmụ Amọn. Ha agbasoghị ụzọ m, ha emekwaghị ihe ndị ahụ m gụrụ dịka ezi ihe. Ha edebeghị iwu m na ụkpụrụ m niile dịka Devid nna Solomọn mere.
34“ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile.
35Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri.
36Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị.
37Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel.