34“ ‘Ma agaghị m anapụ alaeze ya ugbu a, nʼihi ohu m Devid, onye m họpụtara, na onye mere ihe tọrọ m ụtọ. Aga m ahapụ Solomọn ka ọ nọgide dịka eze ụbọchị ndụ ya niile.
35Ma aga m anapụ alaeze ya site nʼaka nwa ya, nye gị ebo iri.
36Nwa ya ka m ga-enye otu ebo, nʼihi na achọrọ m ka Devid ohu m nọgide ịbụ eze Jerusalem, obodo m họpụtara nye onwe m, ebe m mere ka Aha m dịrị.
37Ma otu ọ dị, gị ka m ga-ewere. Ị ga-abụkwa onye ga-achị ebe ahụ niile obi gị chọrọ; i ga-abụ eze Izrel.
38Ọ bụrụ na i gee ntị mee ihe niile m ga-enye gị nʼiwu, jekwa ije nʼirubere m isi, mee ihe ziri ezi nʼanya m, site nʼidebe ụkpụrụ niile na iwu niile, dịka ohu m Devid mere, aga m anọnyere gị. Aga m ewuru gị ụlọ ga-adịgide dịka m siri wuoro Devid. Aga m enyekwa gị Izrel.