1 Ndị Eze 11

Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn?

1 Kings 11:41 (UKJV) And the rest of the acts of Solomon, and all that he did, and his wisdom, are they not written in the book of the acts of Solomon?

39Aga m eweda agbụrụ Devid nʼihi ihe a, ma ha agaghị abụ ndị e wedara nʼala ruo ebighị ebi.’ ”

40Solomọn gbalịrị igbu Jeroboam, ma Jeroboam gbaara ọsọ gbakwuru eze Shishak nke Ijipt. Ọ nọkwara nʼIjipt ruo mgbe Solomọn nwụrụ.

41Ma banyere ihe ndị ọzọ mere nʼoge ọchịchị Solomọn, nke bụ, ihe niile o mere na amamihe o gosipụtara, ọ bụ na-edeghị ha nʼakwụkwọ akụkọ nke Solomọn?

42Solomọn chịrị Izrel niile iri afọ anọ na Jerusalem.

43O sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid bụ nna ya. Rehoboam nwa ya, ghọkwara eze nʼọnọdụ nna ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.