31Jeroboam wuru ebe ịchụ aja nʼebe dị elu dị iche iche. Ọ họpụtara ndị nchụaja site nʼetiti ndị Izrel niile, nʼagbanyeghị na ha abụghị ndị Livayị.
32O hiwere mmemme a na-eme nʼụbọchị nke iri na ise nʼọnwa nke asatọ, dịka mmemme a na-eme na Juda. Ọ chụkwara aja nʼebe ịchụ aja. O mere nke a na Betel, chụọrọ ụmụ ehi ọlaedo ahụ ọ kpụrụ aja. O tinyere ndị nchụaja nʼọrụ nʼebe niile dị elu nke o mere ka ha dịrị na Betel.
33Nʼụbọchị nke iri na ise, nʼọnwa asatọ, bụ ọnwa nke ya onwe ya chepụtara, ọ chụrụ aja dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja o wuru na Betel. Ya mere, o hiwere mmemme a ka ọ dịịrị ndị Izrel niile; ya onwe ya kwa gara chụọ aja onyinye dị iche iche nʼelu ebe ịchụ aja.