1Otu onye nke Chineke si Juda bịa Betel, site nʼokwu nke Onyenwe anyị oge Jeroboam guzo nʼebe ịchụ aja ka ọ chụọ aja.
2O tiri mkpu nʼoke olu megide ebe ịchụ aja ahụ dịka okwu Onyenwe anyị si dị, “Ebe ịchụ aja, ebe ịchụ aja! Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu: ‘A ga-amụ otu nwa nwoke nʼụlọ Devid, aha ya ga-abụ Josaya. Ọ ga-eji ndị nchụaja niile nke ebe dị elu, bụ ndị na-achụ aja nʼelu gị, chụọ aja nʼelu gị. A ga-esurekwa ọkpụkpụ ndị mmadụ ọkụ nʼelu gị.’ ”
3Nʼụbọchị ahụ, onye nke Chineke ahụ kwuru okwu banyere ihe ịrịbama ga-emezu. O kwuru sị, “Nke a bụ ihe ịrịbama Onyenwe anyị ji emesi okwu ya ike: Ebe ịchụ aja a ga-agbawa ụzọ abụọ. Ntụ dị nʼelu ya ga-awụsasị nʼala.”