1 Ndị Eze 13

Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel.

1 Kings 13:10 (UKJV) So he went another way, and returned not by the way that he came to Bethel.

8Ma onye nke Chineke ahụ zara eze sị, “Ọ bụrụ na i nye m ọkara ihe niile i nwere, agaghị m eso gị baa nʼime ụlọ gị. Agaghị m erikwa nri gị maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe a.

9Nʼihi na-enyere m iwu site nʼokwu Onyenwe anyị, sị, ‘Erila nri, aṅụkwala mmiri, esitekwala ụzọ i si gaa laghachi.’ ”

10Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel.

11Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.

12Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.