10Ya mere, o sitere nʼụzọ ọzọ lawa, nke na-abụghị ụzọ o si bịa Betel.
11Ma o nwere otu onye amụma bụ agadi bi na Betel. Onye ụmụ ya bịara kọọrọ ihe niile onye nke Chineke ahụ mere nʼụbọchị ahụ na Betel, ha kọkwaara nna ha ihe niile ọ gwara eze.
12Nna ha jụrụ ha, “Olee ụzọ ọ gara?” Ụmụ ya ndị ikom ziri ya ụzọ nke onye nke Chineke ahụ si Juda gara.
13Mgbe ahụ, ọ sịrị ụmụ ya ndị ikom, “Jikekwaranụ m ịnyịnya ibu m.” Ha jikekwaara ya ịnyịnya ibu, ọ nọkwasịrị nʼelu ya.
14Ọ gbasooro onye nke Chineke nʼazụ, ọ hụrụ ya ka ọ nọ ala nʼokpuru osisi ook, Ọ sịrị ya, “Ọ bụ gị bụ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa?” Ọ zara, “E, ọ bụ mụ onwe m.”