17Nʼihi na a gwara m site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Erikwala nri maọbụ ṅụọ mmiri nʼebe ahụ, maọbụ soro ụzọ ị si gaa lọtakwa.’ ”
18Ma onye nke ọzọ sịrị ya, “Mụ onwe m bụkwa onye amụma dịka gị, mmụọ ozi zikwara m ozi site nʼokwu Onyenwe anyị sị, ‘Kpọrọ ya ka o soro gị laghachi nʼụlọ gị, ka o rie nri, ṅụọkwa mmiri.’ ” (Ma ọ gwara ya okwu ụgha.)
19Ya mere, nwoke nke Chineke ahụ soro ya laghachi rie nri, ṅụọkwa mmiri.
20Ma mgbe ha abụọ nọdụ na-eri ihe na tebul, okwu Onyenwe anyị rutere onye amụma agadi ahụ ntị, bụ onye mere ka ọ lọghachi azụ.
21Ọ kpọrọ onye nke Chineke ahụ si Juda bịa sị ya, “Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘Nʼihi na ị nupula isi nʼokwu ọnụ Onyenwe anyị, hapụ idebe iwu Onyenwe anyị Chineke gị nyere gị.