30O liri ozu onye nke Chineke ahụ nʼili nke aka ya. Mgbe o liri ya, ọ kwara akwa sị, “Ewoo nwanna m!”
31Mgbe o lisiri ya, ọ gwara ụmụ ya ndị ikom sị, “Mgbe m nwụrụ, lienụ m nʼotu ili a e liri onye nke Chineke; doonụ ọkpụkpụ m ka ọ dịrị nʼakụkụ ọkpụkpụ ya.
32Nʼihi na ozi ahụ niile o ziri site nʼokwu Onyenwe anyị megide ebe ịchụ aja dị na Betel, na megidekwa ebe ụlọ arụsị niile dị nʼebe dị elu nʼobodo Sameria aghaghị imezu.”
33Nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, Jeroboam esiteghị nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Kama ọ gara nʼihu họpụta ndị nchụaja maka ebe niile dị elu site nʼetiti ndị mmadụ efu. Onye ọbụla chọrọ ị bụ onye nchụaja ka o doro nsọ maka ije ozi nʼebe niile dị elu.
34Nke a bụ mmehie ezinaụlọ Jeroboam. Ọ bụ ya mere alaeze Jeroboam ji daa, meekwa ka e kpochapụ ya nʼelu ụwa.