1 Ndị Eze 14

Mgbe ahụ, ndị Juda mehiekwara megide Onyenwe anyị. Ha sitere nʼọtụtụ mmehie ha mere, nke karịrị mmehie nke ndị nna nna ha ochie mere, kpasuo ekworo ya.

1 Kings 14:22 (UKJV) And Judah did evil in the sight of the LORD, and they provoked him to jealousy with their sins which they had committed, above all that their fathers had done.

20Jeroboam chịrị Izrel iri afọ abụọ na abụọ. O sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, nwa ya Nadab ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.

21Nʼoge a, Rehoboam nwa Solomọn, bụ eze Juda. Ọ gbara iri afọ anọ na otu mgbe ọ malitere ịbụ eze. Ọ chịrị afọ iri na asaa na Jerusalem, bụ obodo ahụ Onyenwe anyị họọrọ site nʼetiti ebo niile nke Izrel, bụ ebe ọ ga-akpọkwasị Aha ya. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn.

22Mgbe ahụ, ndị Juda mehiekwara megide Onyenwe anyị. Ha sitere nʼọtụtụ mmehie ha mere, nke karịrị mmehie nke ndị nna nna ha ochie mere, kpasuo ekworo ya.

23Ha wukwara nye onwe ha ebe ịchụ aja na ogidi arụsị nʼelu ugwu niile, na ogidi chi Ashera, na nʼokpuru osisi ọbụla akwụkwọ ndụ dị nʼelu ya.

24E nwere ndị ikom akwụna nʼala ahụ, ndị nọ nʼụlọ arụsị ha dị iche iche. Ndị mmadụ mere ụdị ihe arụ ahụ nke ndị mba niile ndị ahụ na-eme, bụ mba ndị ahụ Onyenwe anyị sitere nʼihu ndị Izrel chụpụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.