27Ma eze Rehoboam kpụrụ ọta bronz i ji dochie ndị ahụ, nyefee ha nʼaka ndịisi ndị nche, bụ ndị na-eche nʼọnụ ụzọ ụlọeze nche ka a lekọta ha anya.
28Mgbe ọbụla eze na-aga nʼụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ndị nche na-ebu ọta ndị ahụ, emesịa, ha na-ebughachikwa ha nʼime ụlọ ndị nche.
29Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Rehoboam, na ihe niile o mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda?
30Agha dịgidere nʼetiti Rehoboam na Jeroboam ụbọchị niile nke ndụ ha.
31Rehoboam sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼebe e liri ha nʼobodo Devid. Aha nne ya bụ Naama, onye Amọn. Abija nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.