1 Ndị Eze 15

Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe.

1 Kings 15:30 (UKJV) Because of the sins of Jeroboam which he sinned, and which he made Israel sin, by his provocation wherewith he provoked the LORD God of Israel to anger.

28Baasha gburu Nadab, nọchie ọnọdụ ya dịka eze, nʼafọ nke atọ nke ọchịchị Asa, eze Juda.

29Ngwangwa, mgbe ọ malitere ọchịchị ya, o gburu ndị ezinaụlọ Jeroboam niile. O kweghị ka onye ọbụla na-eku ume fọdụ, kama ọ lara ha niile nʼiyi, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ onyeozi ya, bụ Ahija onye Shilo.

30Ihe ndị a mere nʼihi mmehie niile Jeroboam mere, nke o mere ka Izrel mee, nakwa nʼihi na ọ kpasuru Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel iwe.

31Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Nadab, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ihe mere nʼoge ndị eze Izrel?

32Ma agha dịgidere nʼetiti Asa na Baasha, eze Izrel, ụbọchị ọchịchị ha niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.