2Ọ chịrị afọ atọ na Jerusalem. Aha nne ya bụ Maaka, nwa nwanyị Abishalom.
3O mere mmehie niile nna ya mere nʼihu ya; o jighị obi zuruoke gbasoo Onyenwe anyị Chineke ya, dịka obi nna nna ya Devid dị.
4Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike.
5Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het.
6Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija.