4Ma nʼihi Devid, Onyenwe anyị Chineke ya nyere ya oriọna na Jerusalem, site na-ime ka nwa ya nwoke nọchie ọnọdụ ya nakwa ime ka Jerusalem guzosie ike.
5Nʼihi na Devid mere ihe ziri ezi nʼanya Onyenwe anyị, ọ dịghịkwa iwu Onyenwe anyị ọbụla nke ọ na-edebeghị nʼụbọchị ndụ ya niile, ma ọ bụghị naanị ihe banyere okwu Ụraya, onye Het.
6Agha dị nʼetiti Abija na Jeroboam nʼụbọchị niile nke ndụ Abija.
7Ma banyere ihe ndị ọzọ niile mere nʼoge ọchịchị Abija, o bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ndị eze Juda? Agha dịgidere nʼetiti Abija na Jeroboam.
8Abija sooro nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya nʼobodo Devid. Asa, nwa ya nwoke ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.