1 Ndị Eze 16

Mgbe ahụ, ozi Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Jehu, nwa Hanani banyere Baasha, eze Izrel sị ya,

1 Kings 16:1 (UKJV) Then the word of the LORD came to Jehu the son of Hanani against Baasha, saying,

1Mgbe ahụ, ozi Onyenwe anyị sitere nʼọnụ Jehu, nwa Hanani banyere Baasha, eze Izrel sị ya,

2“Esi m nʼaja welie gị elu, mee gị onye ọchịchị ndị m Izrel. Ma i jeela ije nʼụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam. I meela ka ndị m bụ Izrel mmehie, si otu a kpasuo m iwe site na mmehie ha.

3Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.