1 Ndị Eze 16

Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?

1 Kings 16:14 (UKJV) Now the rest of the acts of Elah, and all that he did, are they not written in the book of the chronicles of the kings of Israel?

12Ya mere, Zimri kpochapụrụ ndị ezinaụlọ niile Baasha, nʼusoro okwu Onyenwe anyị kwuru megide Baasha site nʼọnụ onye amụma ya bụ Jehu.

13Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru.

14Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?

15Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha.

16Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.