13Nʼihi mmehie niile nke Baasha na nwa ya Ela mere, na nke ha ji mee ka Izrel mehie, bịakwa kpasuo iwe Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel, site nʼarụsị ha niile na-abaghị uru.
14Akụkọ banyere ọchịchị Ela, na ihe niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ ọchịchị ndị eze Izrel?
15Nʼafọ nke iri abụọ na asaa nke ọchịchị Asa, eze Juda, ka Zimri chịrị ụbọchị asaa na Tịaza. Nʼoge a, ndị agha Izrel mara ụlọ ikwu na Gibeton, obodo ndị Filistia na-ebu agha.
16Mgbe ha nụrụ na Zimri egbuola eze ha, ha niile kwekọtara mee Omri eze ọhụrụ ha. Omri bụ onyeisi agha ndị agha Izrel niile.
17Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha.