17Nʼihi nke a, Omri duuru ndị agha ahụ nọ na Gibeton bịa ibuso Tịaza, isi obodo Izrel agha.
18Mgbe Zimri hụrụ na-adọtala obodo ahụ nʼagha, ọ banyere nʼụlọ elu dị nʼụlọeze, sunye onwe ya na ụlọeze ahụ ọkụ. O si otu a nwụọ,
19nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie.
20Akụkọ banyere Zimri na ihe ọjọọ niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
21Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat.