18Mgbe Zimri hụrụ na-adọtala obodo ahụ nʼagha, ọ banyere nʼụlọ elu dị nʼụlọeze, sunye onwe ya na ụlọeze ahụ ọkụ. O si otu a nwụọ,
19nʼihi na Zimri nʼonwe ya mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị dịka Jeroboam. Ọ kpọrọ isiala nye arụsị, dubakwa ụmụ Izrel nʼime mmehie.
20Akụkọ banyere Zimri na ihe ọjọọ niile o mere e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
21Ma nʼoge a, ndị Izrel kere onwe ha ụzọ abụọ maka onye ga-abụ eze ha. Otu ụzọ dịnyeere Omri, ndị nke ọzọ dịnyeere Tibni, nwa Ginat.
22Ma ndị dịnyeere Omri dị ike karịa ndị dịnyeere Tibni, nwa Ginat. Ya mere, Tibni nwụrụ. Omri ghọkwara eze Izrel.