27Akụkọ ihe niile Omri mere, ọ bụ na e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọchịchị ndị eze Izrel?
28Omri sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Sameria. Ehab, nwa ya ghọrọ eze nʼọnọdụ ya.
29Nʼafọ nke iri atọ na asatọ nke ọchịchị eze Asa na Juda, ka Ehab, nwa Omri, malitere ịchị dịka eze nʼIzrel. Ọ chịrị ndị Izrel iri afọ abụọ na abụọ na Sameria.
30Ehab nwa Omri mere ihe ọjọọ nʼanya Onyenwe anyị karịa ndị eze niile buru ya ụzọ.
31Ọ bụghị naanị na ọ gụrụ mmehie niile Jeroboam nwa Nebat mere dị ka ihe dị nta, kama ọ gara nʼihu lụọ Jezebel, nwa nwanyị Etbaal, eze ndị Saịdọn. O bidokwara ịkpọ isiala nye arụsị Baal, na ife ya ofufe.