2“Esi m nʼaja welie gị elu, mee gị onye ọchịchị ndị m Izrel. Ma i jeela ije nʼụzọ ọjọọ niile nke Jeroboam. I meela ka ndị m bụ Izrel mmehie, si otu a kpasuo m iwe site na mmehie ha.
3Ya mere, aga m ekpochapụ Baasha na ezinaụlọ ya, m ga-emekwa ụlọ gị ka ọ dịka ụlọ Jeroboam, nwa Nebat.
4Onye ọbụla nke metụtara Baasha nke nwụrụ nʼime obodo ka nkịta ga-eri ozu ya, ma ndị nwụrụ nʼọhịa ka anụ ufe nke eluigwe ga-eri ozu ha.”
5Akụkọ niile banyere ọrụ Baasha rụrụ, na ibu agha ya niile, e deghị ha nʼakwụkwọ akụkọ ọrụ ndị eze Izrel?
6Baasha sooro ndị nna nna ya ha dina nʼọnwụ, e lie ya na Tịaza. Ela, nwa ya nwoke, nọchiri ọnọdụ ya dịka eze.