1 Ndị Eze 17

Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.”

1 Kings 17:12 (UKJV) And she said, As the LORD your God lives, I have not a cake, but an handful of meal in a barrel, and a little oil in a cruse: and, behold, I am gathering two sticks, that I may go in and dress it for me and my son, that we may eat it, and die.

10Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.”

11Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.”

12Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka Onyenwe anyị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.”

13Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri.

14Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.