1 Ndị Eze 17

Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.

1 Kings 17:16 (UKJV) And the barrel of meal wasted not, neither did the cruse of oil fail, according to the word of the LORD, which he spoke by Elijah.

14Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ”

15Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya.

16Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.

17Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya.

18Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.