1 Ndị Eze 17

Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya.

1 Kings 17:15 (UKJV) And she went and did according to the saying of Elijah: and she, and he, and her house, did eat many days.

13Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri.

14Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ Onyenwe anyị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ”

15Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya.

16Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu Onyenwe anyị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma.

17Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.