1 Ndị Eze 17

Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.”

1 Kings 17:4 (UKJV) And it shall be, that you shall drink of the brook; and I have commanded the ravens to feed you there.

2Okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, sị ya,

3“Si nʼebe a pụọ. Soro ụzọ ọwụwa anyanwụ, gaa zoo onwe gị nʼakụkụ iyi Kerit, nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ ya, nke bụ nʼihu Jọdan.

4Nọdụ nʼebe ahụ ṅụọ mmiri si nʼiyi ahụ, riekwa nri ọbụla ụmụ ugolọma ga-ebutere gị, nʼihi na enyela m ha iwu ka ha nye gị nri.”

5O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ.

6Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.