1 Ndị Eze 17

Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ.

1 Kings 17:7 (UKJV) And it came to pass after a while, that the brook dried up, because there had been no rain in the land.

5O mere ihe Onyenwe anyị gwara ya ka o mee. Ọ gara nʼakụkụ iyi nta Kerit nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Jọdan nọrọ nʼebe ahụ.

6Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.

7Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ.

8Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya,

9“Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.”

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.