6Ugolọma na-ebutere ya achịcha na anụ, ụtụtụ na anyasị niile. Ọ na-aṅụkwa mmiri site nʼiyi ahụ.
7Ma mgbe ụbọchị ụfọdụ gasịrị, mmiri ahụ tara, nʼihi na mmiri adịghị ezokwa nʼala ahụ.
8Okwu Onyenwe anyị bịakwutere ya,
9“Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.”
10Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.”