1Mgbe ọtụtụ oge gasịrị, nʼafọ nke atọ, okwu Onyenwe anyị rutere Ịlaịja ntị, “Bilie, gaa gosi Ehab onwe gị. Aga m emekwa ka mmiri zookwa nʼala a.”
2Ya mere, Ịlaịja pụrụ gaa igosi Ehab onwe ya. Ma ụnwụ dị na Sameria nʼoge a siri nnọọ ike.
3O nwere otu nwoke na-elekọta ihe dị nʼezinaụlọ Ehab. Aha ya bụ Ọbadaya. (Ọ bụ nwoke ji obi ya niile kwere na Onyenwe anyị.
4Mgbe eze nwanyị bụ Jezebel na-egbu ndị amụma Onyenwe anyị chọọ igbuchapụ ha, ọ bụ Ọbadaya zoro narị ndị amụma nʼime ha nʼime ọgba nkume. O zoro iri ndị amụma ise nʼotu ọgba nkume, zookwa iri ndị amụma ise fọdụrụ nʼime ọgba nkume ọzọ. Emesịa, ọ na-ewegara ha nri na mmiri nʼebe ahụ.)