1 Ndị Eze 18

“Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru. Ịlaịja nyekwara ha iwu sị, “Gbajukwaanụ ya nke ugboro atọ, bịa wụkwasị ya.” Ha mekwara otu a.

1 Kings 18:34 (UKJV) And he said, Do it the second time. And they did it the second time. And he said, Do it the third time. And they did it the third time.

32O ji nkume ndị a wuzie ebe ịchụ aja Onyenwe anyị. Emesịa, o gwuru olulu miri emi, nke gbara ebe ịchụ aja ahụ gburugburu.

33Ọ tụkwasịrị nkụ nʼelu ebe ịchụ aja ahụ, tụkwasịkwa otu oke ehi o gbujasịrị nʼelu nkụ ndị ahụ. Emesịa, o nyere ndị nọ nʼebe ahụ iwu sị ha, “Gbajuonụ ite anọ mmiri. Butekwanụ mmiri ahụ bịa wụkwasị ya nʼelu aja nsure ọkụ a, na nʼelu nkụ ndị a.” Mgbe ha mesiri nke a, Ịlaịja gwara ha okwu sị,

34“Gbajukwaanụ ite mmiri ndị ahụ, bute ha bịa wụkwasị mmiri ahụ nke ugboro abụọ nʼelu aja nsure ọkụ a.” Ha mere dịka Ịlaịja kwuru. Ịlaịja nyekwara ha iwu sị, “Gbajukwaanụ ya nke ugboro atọ, bịa wụkwasị ya.” Ha mekwara otu a.

35Mmiri jupụtakwara nʼebe ịchụ aja ahụ, na olulu ahụ dị ya gburugburu.

36Mgbe oge e ji achụ aja anyasị ruru, Ịlaịja, onye amụma bịara ebe ịchụ aja ahụ nso kpee ekpere sị, “O, Onyenwe anyị Chineke Ebraham, na Aịzik, na Izrel, biko gosi taa na ọ bụ gị onwe gị bụ naanị Chineke nʼIzrel, na mụ onwe m bụkwa ohu gị. Gosikwa na m bụ onyeozi gị, na ọ bụ ihe i nyere m nʼiwu ka m mere oge ndị a niile.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.